Igbo: The Sleepy Sheep Tail Tale

AKỤKỌ ỌDU ATURU NA ÉMÉ ORI-ỤRA-ỌMU-ANYA

Otu mgbé, ézé atụrụ nwé na igwé-atụrụ karia; nké méré ni na o nwékwa gi iké ikwu atụrụ ọlé o nwéré; ya a na wéré méé igba ihé ibé, wéré wéputa otu akpa égo na atọ -égo é jiri nwagwara mée – a ga ényé onyé ọwula nwéré iké ᴉ gwa ya atụrụ ọlé o nwéré.

Otu ubọchi, ogé ézigbo anwu na acha, otu nwatakiri nwoké -o ché atụrụ- é wéré zuzu féé, na wéré guọ atụrụ ndééa ọnụ; nké wụ na ọ ga la éri égo a é wéhụtara, ma na oké umé-ngwụ é jidé ya, nkéé wụ na onwéghii iké na ikpétémazụ gwa onyé ézé ihé o méré, na wéré nwéé iké chikọrọ cha égo ndi ahu éjiri nwa gwara na égbu wam-wam méé. Ikékwa, gaa onwé-gi nwé kwara iké na rita ha ọwụrụ na ᴉ sachaa anya gi na géé kwa nti nké ọma na ihé nwatakiri nwoké oché-atụrụ méré.

Nwatakiri nwoké a é wéré kwuo si: “Ézé nwoké”, “ᴉgụ atụrụ gi ọnụ di nfé dika tiri aki taa; ᴉ méé ya nᴉ,ényéghi nsogbu ma out. Atụrụ ọwụla nwéré otu ọdụ na éféghari pkaka-pkaka; nké wụ, ya wụrụ bédi nwatakiri di ka nm, o kwéshiri ᴉgụ naani ọdụ pkaka-pkaka ha; na wéré kwa gunyé atụrụ gi nké nọ na ikpétémazụ ikpétémazụ, nké nya édégala na akụshi ézigbo iké éjiri igwé ọcha méé.”

Nwatakiri nwoké a ana béa wéré nkpara ogologo ya, nké nwéré ọnụ nguru, éji a chi atụrụ; ya a na wéré gawa na imé ugbo achara, ébé atụrụ agụrụ na agụ na ata achara. Ogé anyasu ahu, mgbé ogé dụrụ i ji chibata atụrụ ndé ụra na atụ na imé ogba, ya é wéré chikọọ na otu ébé, ozugbo nwaévula ndé agadi mpi ha gbara ngọ; na wéré kwa chikọọ ozugbo nné atụrụ na agbara ha na otu ébé, na béa kwa chikọọ ozugbo atụrụ ọcha na atụrụ ojii na otu ébé; ya a na béa wéré nkpara ya na akụ na ahíhia i ji wéré duru ha gaféré na imé achara, wéré soroo ụzọ nwa okpo, na wéré gaaféré oshishi na ohea, téféré kwa élu okwuté, na wéré gbadaa, na kụféré iyi nmiri. I ji kụféré nmiri wéré gaa na mpaghari ọzọ, atụrụ ụra na atụ téféré la ogwé nwéré arche é jiri oshishi méé; nkéé wụ na naani otu atụrụ ga é nwé iké i gafé ya na otu ogé. Ozugbo atụrụ a na wéré sopia onweha na azụ na otu na otu; ya é wéré wụrụ na imi otu atụrụ na éso ọdụ na éfé kpaka-pkaka nọ ya na ihụ; étuaa wụ étu ha jiri gaa, wéré ruo ogé ha ninéé gafé chara; nké po azụ, nya na olu ya édégala na akushi iké, é jiri igwé ọ cha méé.

Ị nwéré iké: méshié anya gi wéré hu atụrụ? Ọ wụrụ na i nwéré iké, ọ wụrụ na ichọrọ i rita ihé nrita –otu akpa na atọ, na kirikiri égo- é jiri nwagwara méé - i ga é mé dika nwatakiri nwoké onyé-nché-atụrụ jiri méé; na wéré guo ọdụ atụrụ ọwụla na éfé kpakara-kpakara mgbé ha na a gafé: ndé agadi nna nwaévula nwéré mpi gbagọrọ-agbagọ, na kwa ndé nné atụrụ, ha na ụmụ-agbara ha so, na kwa atụrụ ojii na atụrụ ọcha. Méshiéé anya gi, na béa wéré nwayọọ gụọ ọdụ mgbé ha na agafé, wéré ruo mgbé ozugbo ha gaféchara, shi na mbido ishi ogwé wéré ruo na ishi ngwucha ya. Otu ọdụ na éfé pkakara-kpakara; abuo, atọ, anọ: ọdụ pkakara-kpakara; isé, i shii … Na agụ; méshié anya; ogé i nụrụ ụda édégala é jiri igwé ọma méé, édégala na akụrụ atụrụ nké po azu, ọdụ nkéa po azu wụ ngwucha akụkọ uféré!





Previous Video
Children's Section Rhymes Stories Rhymes and Stories
Next Video